Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge a, ụfọdụ nʼime ndị Kaldịa pụtara nʼihu boo ndị Juu ebubo.

Daniel 3:8 in English

Daniel 3:8 · Berean Standard Bible

At this time some astrologers * came forward and maliciously accused the Jews,

Context

6Onye ọbụla juru ịkpọ isiala ka a ga-atụba ngwangwa nʼime ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu.” 7Ya mere, ngwangwa ha nụrụ ụda opi ike, nke ọja, une ụbọ akwara, nke une na nke egwu dị iche iche, ndị niile si mba dị iche iche, ndị na-asụ asụsụ dị iche iche, dara nʼala kpọọ isiala nye oyiyi ọlaedo ahụ, nke eze bụ Nebukadneza guzobere. 8Nʼoge a, ụfọdụ nʼime ndị Kaldịa pụtara nʼihu boo ndị Juu ebubo. 9Ha gwara eze, bụ Nebukadneza, “Ka eze dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. 10Gị, onwe gị nyere iwu, na onye ọbụla nụrụ ụda opi ike, ọja, une, ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ ga-akpọ isiala sekpuoro ihe ahụ e ji ọlaedo kpụọ,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.