Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka mkpịsịụkwụ ya, nke ụfọdụ nʼime ya bụ igwe, ụfọdụ bụkwa ụrọ, na-egosi na akụkụ ụfọdụ nke alaeze ahụ ga-esi ike ma akụkụ ụfọdụ agaghị esi ike ntiwa.

Daniel 2:42 in English

Daniel 2:42 · Berean Standard Bible

And as the toes of the feet were partly iron and partly clay, so this kingdom will be partly strong and partly brittle.

Context

40A ga-enwekwa alaeze nke anọ, nke ga-esi ike dịka igwe. Dịka igwe nke na-akụri ihe niile, ọ ga-egwepịa ma kụrikwaa ndị a niile. 41Ma ebe ị hụrụ na ọbụ ụkwụ ahụ na mkpịsịụkwụ ya niile na ụfọdụ nʼime ha bụ ụrọ ọkpụ ite na ụfọdụ bụkwa igwe, alaeze nke ekewara ekewa ka ọ ga-abụ, ma ọ ga-esitụ ike dịka igwe nke dị nʼime ya, nʼihi na ị hụrụ igwe ahụ na agwakọtara ya na ụrọ apịtị. 42Dịka mkpịsịụkwụ ya, nke ụfọdụ nʼime ya bụ igwe, ụfọdụ bụkwa ụrọ, na-egosi na akụkụ ụfọdụ nke alaeze ahụ ga-esi ike ma akụkụ ụfọdụ agaghị esi ike ntiwa. 43Dịka otu ahụ ị hụrụ e siri gwakọta igwe na ụrọ ọnụ, otu a ka ọchịchị alaeze ndị a ga-achọ njikọta alaeze na ibe ya, ma nke a agaghị ekwe mee, dịka ọ gaghị ekwe omume bụ ịgwakọta igwe na ụrọ. 44“Nʼoge ahụ, ndị eze ndị a ga-anọ nʼọchịchị, Chineke nke eluigwe ga-eme ka alaeze ọzọ bido. Ọ bụkwa alaeze nke a na-apụghị imebi emebi. O nwekwaghị onye ọbụla pụrụ imeri alaeze ahụ. Ọ ga-ala alaeze ndị ọzọ nʼiyi, mee ka ha bụrụ ihe efu, ma ọ ga-adịrị na-aga nʼihu ruo ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.