Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ sịrị ha, “Arọrọ m nrọ nke na-enye m nsogbu nʼobi. Achọrọ m ịma ihe ọ pụtara.”

Daniel 2:3 in English

Daniel 2:3 · Berean Standard Bible

he said to them, “I have had a dream, and my spirit is anxious to understand it.”

Context

1Nʼime afọ nke abụọ nke ọchịchị ya, eze Nebukadneza rọrọ nrọ dị iche iche. Nrọ ndị a mere ka obi ya gbasasịa, ụra pụkwara ya nʼanya. 2Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị majiki, ndị ha na mmụọ ọjọọ na-ekwu okwu, ndị mgbaasị na ndị ihe banyere ngagharị nke kpakpando doro anya ka ha bịa gwa ya ihe ahụ ọ rọrọ na nrọ. Mgbe ha bịara, guzo nʼihu eze, 3ọ sịrị ha, “Arọrọ m nrọ nke na-enye m nsogbu nʼobi. Achọrọ m ịma ihe ọ pụtara.” 4Mgbe ahụ, ndị ahụ na-enyocha kpakpando gwara eze ahụ okwu nʼasụsụ ndị Siria sị, “Ka gị eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, Ị ga-agwa ụmụodibo gị nrọ a ị rọrọ, anyị ga-akọwara gị ihe ọ pụtara.” 5Ma eze zara ndị Kaldịa, “Nke a bụ ihe m kpebirila: Ọ bụrụ na unu agwaghị m ihe nrọ a na nkọwa ya bụ, aga m eme ka abọkasịa unu, tikpọkwa ụlọ unu, mee ka ha ghọọ mkpọmkpọ ebe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.