Daniel 12:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ ka a ga-eme ka ha dị ọcha, sachaa ha mee ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ, a ga-anụchakwa ha. Ma ndị ajọ omume ga-aga nʼihu nʼajọ omume ha. O nweghị onye ajọ omume nke ga-aghọtakwa ihe, ma ndị ahụ maara ihe ga-aghọta ihe ihe a pụtara.
Daniel 12:10 in English
Daniel 12:10 · Berean Standard Bible
Many will be purified, made spotless, and refined, but the wicked will continue to act wickedly. None of the wicked will understand, but the wise will understand.
Context
8Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?” 9Ọ sịrị, “Daniel, gawara onwe gị. Nʼihi na-apịachiela okwu ndị a, kachiekwa ya akara tutu ruo nʼọgwụgwụ oge. 10Ọtụtụ ka a ga-eme ka ha dị ọcha, sachaa ha mee ka ha dị ọcha na-enweghị ntụpọ, a ga-anụchakwa ha. Ma ndị ajọ omume ga-aga nʼihu nʼajọ omume ha. O nweghị onye ajọ omume nke ga-aghọtakwa ihe, ma ndị ahụ maara ihe ga-aghọta ihe ihe a pụtara. 11“Site nʼoge e mechiri ịchụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ kwa ụbọchị niile ruo nʼoge a ga-ewuli ihe arụ ahụ nke na-eweta mbibi, ga-abụ otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị itoolu. (1,290) 12Ngọzị ga-adịrị onye ahụ nke na-echere, ma nọgidesịkwa ike ruo mgbe otu puku ụbọchị, na narị ụbọchị atọ, na iri ụbọchị atọ na ise (1,335) ahụ gafere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.