Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma onyeisi ndị na-achị alaeze Peshịa gbochiri m, kemgbe iri ụbọchị abụọ na otu. Ya mere, Maikel, otu nʼime ndịisi ọchịchị bịara nyere m aka, nʼihi na mụ onwe m fọdụrụ nʼebe ahụ mụ na eze Peshịa.

Daniel 10:13 in English

Daniel 10:13 · Berean Standard Bible

However, the prince of the kingdom of Persia opposed me for twenty-one days. Then Michael, one of the chief princes, came to help me, for I had been left there with the kings of Persia.

Context

11Ọ sịrị m, “Daniel, gị onye a hụrụ nʼanya nke ukwuu. Gee ntị tuleekwa nke ọma okwu niile m na-agwa gị ugbu a. Guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na e zitere m ịbịakwute gị.” Mgbe ọ na-agwa m okwu a, eguzooro m ọtọ, na-ama jijiji. 12Ọ sịrị m, “Egwu atụla gị, Daniel. Nʼihi na site nʼụbọchị mbụ i kpebiri inwe nghọta na iweda onwe gị ala nʼihu Chineke gị, ka a nụrụ okwu gị niile, a bịakwara m nʼihi ọsịsa ha. 13Ma onyeisi ndị na-achị alaeze Peshịa gbochiri m, kemgbe iri ụbọchị abụọ na otu. Ya mere, Maikel, otu nʼime ndịisi ọchịchị bịara nyere m aka, nʼihi na mụ onwe m fọdụrụ nʼebe ahụ mụ na eze Peshịa. 14Ugbu a, abịala m ime ka ị ghọta ihe ga-adakwasị ndị gị nʼoge ikpeazụ nʼụbọchị dị nʼihu. Nʼihi na ọhụ ndị a dịrị oge ndị na-abịa nʼihu.” 15Mgbe ọ na-agwa m okwu ndị a, ekpunyere m ihu m nʼala enwekwaghị m ike ikwu okwu ọbụla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.