Daniel 10:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị m, “Daniel, gị onye a hụrụ nʼanya nke ukwuu. Gee ntị tuleekwa nke ọma okwu niile m na-agwa gị ugbu a. Guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na e zitere m ịbịakwute gị.” Mgbe ọ na-agwa m okwu a, eguzooro m ọtọ, na-ama jijiji.
Daniel 10:11 in English
Daniel 10:11 · Berean Standard Bible
He said to me, “Daniel, you are a man who is highly precious. Consider carefully the words that I am about to say to you. Stand up, for I have now been sent to you.” And when he had said this to me, I stood up trembling.
Context
9Mgbe ahụ, anụrụ m ụda olu ya, ma mgbe m nụrụ ụda olu ya, adara m nʼala kpudo ihu nʼala nʼọnọdụ ịda nʼoke ụra. 10Ma otu aka metụrụ m, welite m mee ka m maa jijiji nʼelu ikpere m na aka m abụọ. 11Ọ sịrị m, “Daniel, gị onye a hụrụ nʼanya nke ukwuu. Gee ntị tuleekwa nke ọma okwu niile m na-agwa gị ugbu a. Guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na e zitere m ịbịakwute gị.” Mgbe ọ na-agwa m okwu a, eguzooro m ọtọ, na-ama jijiji. 12Ọ sịrị m, “Egwu atụla gị, Daniel. Nʼihi na site nʼụbọchị mbụ i kpebiri inwe nghọta na iweda onwe gị ala nʼihu Chineke gị, ka a nụrụ okwu gị niile, a bịakwara m nʼihi ọsịsa ha. 13Ma onyeisi ndị na-achị alaeze Peshịa gbochiri m, kemgbe iri ụbọchị abụọ na otu. Ya mere, Maikel, otu nʼime ndịisi ọchịchị bịara nyere m aka, nʼihi na mụ onwe m fọdụrụ nʼebe ahụ mụ na eze Peshịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.