Ndị Kọlọsị 2:20
Colossians 2:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche?
Colossians 2:20 in English
Colossians 2:20 · Berean Standard Bible
If you have died with Christ to the spiritual forces of the world, why, as though you still belonged to the world, do you submit to its regulations:
Context
18Unu ekwela ka onye ọbụla nke ọ na-amasị ife ndị mmụọ ozi maọbụ ibi ndụ umeala nke aghụghọ dị nʼime ya, onye na-ekwu ọtụtụ okwu banyere ọhụ ọ hụrụ, si otu a na-afụli onwe ya elu nʼefu nʼihi echiche nke onwe ya, maa unu ikpe ma napụ unu ihe nrite unu. 19Onye na-adịghị ejidesikwa onye bụ isi aka ike, onye a na-esite nʼaka ya na-eme ka ahụ niile, nke nkwonkwo ha na akwara ha niile na-ejikọta nʼotu, too eto dị ka Chineke si chọọ ka ha too. 20Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche? 21“Ejidela nke a aka, edetụla nke a ire, ebitụkwala nke a aka”? 22Iwu ndị a niile na-ekwu banyere ihe ndị ga-ala nʼiyi mgbe a na-etinye ha nʼọrụ, ha sitere nʼiwu na ozizi nke mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.