Ndị Kọlọsị 2:19
Colossians 2:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-adịghị ejidesikwa onye bụ isi aka ike, onye a na-esite nʼaka ya na-eme ka ahụ niile, nke nkwonkwo ha na akwara ha niile na-ejikọta nʼotu, too eto dị ka Chineke si chọọ ka ha too.
Colossians 2:19 in English
Colossians 2:19 · Berean Standard Bible
He has lost connection to the head, from whom the whole body, supported and knit together by its joints and ligaments, grows as God causes it to grow.
Context
17Ihe ndị a niile bụ onyinyo nke ihe ga-abịa nʼọdịnihu ma nke pụtara ihe dị nʼime Kraịst. 18Unu ekwela ka onye ọbụla nke ọ na-amasị ife ndị mmụọ ozi maọbụ ibi ndụ umeala nke aghụghọ dị nʼime ya, onye na-ekwu ọtụtụ okwu banyere ọhụ ọ hụrụ, si otu a na-afụli onwe ya elu nʼefu nʼihi echiche nke onwe ya, maa unu ikpe ma napụ unu ihe nrite unu. 19Onye na-adịghị ejidesikwa onye bụ isi aka ike, onye a na-esite nʼaka ya na-eme ka ahụ niile, nke nkwonkwo ha na akwara ha niile na-ejikọta nʼotu, too eto dị ka Chineke si chọọ ka ha too. 20Ebe ọ bụ na unu esorola Kraịst nwụọ nʼebe ozizi na amamihe niile nke na-achị ụwa nọ, gịnị mekwaranụ unu ji ka na-ebi ndụ dị ka a ga-asị na unu bụ nke ụwa, gịnị mere unu ji na-edo onwe unu nʼokpuru iwu ya dị iche? 21“Ejidela nke a aka, edetụla nke a ire, ebitụkwala nke a aka”?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.