Emọs 8:13
Amos 8:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼụbọchị ahụ, “ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ike ga-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.
Amos 8:13 in English
Amos 8:13 · Berean Standard Bible
In that day the lovely young women— the young men as well— will faint from thirst.
Context
11“Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,
“mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala,
ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri,
kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị. 12Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ,
sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ;
ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị,
ma ha agaghị achọta ya. 13“Nʼụbọchị ahụ,
“ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ike
ga-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. 14Ndị ahụ na-eji mmehie Sameria na-aṅụ iyi,*
ndị na-asị, ‘Dịka chi gị na-adị ndụ, gị Dan,’
nakwa, ‘Ebe ọ bụ na chi ndị Bịasheba na-adị ndụ,’
ha ga-ada, ha agakwaghị ebilite ọzọ.”
8:3 Ya bụ, ebe ọbụla dere juu
8:9 Ya bụ, ime ka chi jie
8:14 Nʼaha Ashima bụ arụsị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.