Native Bible

Amos 6:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya, site nʼebe ahụ unu jeruo Hamat, obodo ukwu ahụ, mgbe ahụ unu gbada jeruokwa Gat nke dị na Filistia Ha ọ kacha alaeze abụọ unu mma? Ka ala ha ọ karịrị ndị nke unu?

Amos 6:2 in English

Amos 6:2 · Berean Standard Bible

Cross over to Calneh and see; go from there to the great Hamath; then go down to Gath of the Philistines. Are you better than these kingdoms? Is their territory larger than yours?

Context

1Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn, na ndị ahụ na-ebi nʼizuoke nʼugwu Sameria, bụ ndị a maara aha ha na isi mba nke mba niile, ndị agbụrụ Izrel niile na-abịakwute. 2Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya, site nʼebe ahụ unu jeruo Hamat, obodo ukwu ahụ, mgbe ahụ unu gbada jeruokwa Gat nke dị na Filistia Ha ọ kacha alaeze abụọ unu mma? Ka ala ha ọ karịrị ndị nke unu? 3Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa. 4Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi, na-agbatị onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-erikwa anụ ụmụ atụrụ dị mma na ụmụ ehi e mere ka ha gbaa abụba.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.