Emọs 6:1
Amos 6:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn, na ndị ahụ na-ebi nʼizuoke nʼugwu Sameria, bụ ndị a maara aha ha na isi mba nke mba niile, ndị agbụrụ Izrel niile na-abịakwute.
Amos 6:1 in English
Amos 6:1 · Berean Standard Bible
Woe to those at ease in Zion and those secure on Mount Samaria, the distinguished ones of the foremost nation, to whom the house of Israel comes.
Context
1Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn,
na ndị ahụ na-ebi nʼizuoke nʼugwu Sameria,
bụ ndị a maara aha ha na isi mba nke mba niile,
ndị agbụrụ Izrel niile na-abịakwute. 2Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya,
site nʼebe ahụ unu jeruo Hamat, obodo ukwu ahụ,
mgbe ahụ unu gbada jeruokwa Gat nke dị na Filistia
Ha ọ kacha alaeze abụọ unu mma?
Ka ala ha ọ karịrị ndị nke unu? 3Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ
ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.