Native Bible

Amos 5:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu, agaghị m anabata ha. Aja udo nke anụ unu gbara abụba abụrụghị m ihe ọbụla.

Amos 5:22 in English

Amos 5:22 · Berean Standard Bible

Even though you offer Me burnt offerings and grain offerings, I will not accept them; for your peace offerings of fattened cattle I will have no regard.

Context

20Ụbọchị Onyenwe anyị ọ gaghị abụ ụbọchị ọchịchịrị, na-abụghị ìhè, nke oke ọchịchịrị, a na-agaghị enwe ìhè ọbụla na ya? 21“Akpọrọ m mmemme oriri na ọṅụṅụ unu asị, ajụla m ya. Nnọkọ nke oke nzukọ unu adịghị atọkwa m ụtọ. 22A sịkwarị na unu bunyere m aja nsure ọkụ unu na aja mkpụrụ ọka unu, agaghị m anabata ha. Aja udo nke anụ unu gbara abụba abụrụghị m ihe ọbụla. 23Sitenụ nʼebe m nọ wezuga ụzụ ịbụ abụ unu. Agaghị m ege ntị nʼabụ ụbọ akwara unu. 24Kama meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọgharị dịka mmiri, ka ezi omume na-asọgharịbiga oke dịka iyi nke na-adịghị ata ata.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.