Native Bible

Amos 4:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị, “Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ; jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu.

Amos 4:2 in English

Amos 4:2 · Berean Standard Bible

The Lord GOD has sworn by His holiness: “Behold, the days are coming when you will be taken away with hooks, and your posterity with fishhooks.

Context

1Nụrụ okwu a, unu nne ehi nke Bashan, ndị na-ebi nʼelu ugwu Sameria, unu ndị inyom na-emegbu ndị ogbenye, ma zọpịakwa ndị mkpa na-akpa, ndị na-asị di ha, “welatara anyị ihe ọṅụṅụ” 2Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ewerela ịdị nsọ ya ṅụọ iyi, sị, “Ụbọchị ahụ aghaghị ịbịa mgbe a ga-eji nko dọkpụrụ unu pụọ; jiri nko azụ dọkpụrụ ọ bụladị onye ikpeazụ nʼime unu. 3Ọ bụ site nʼoghere dị iche iche e mere na mgbidi obodo, ka onye ọbụla ga-esi nʼahịrị nʼahịrị pụọ, a ga-atụga unu nʼụzọ Hamon.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 4“Gaanụ na Betel, ma jehie. Jeenụ Gilgal mee ka mmehie baa ụba. Butenụ ihe aja unu ụtụtụ niile. Webatakwanụ onyinye otu ụzọ nʼụzọ iri unu nʼụbọchị atọ* ọbụla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.