Ọrụ Ndị Ozi 7:42
Acts 7:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe.* Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma, “ ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja* unu chụụrụ m iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?
Acts 7:42 in English
Acts 7:42 · Berean Standard Bible
But God turned away from them and gave them over to the worship of the host of heaven, as it is written in the book of the prophets: ‘Did you bring Me sacrifices and offerings forty years in the wilderness, O house of Israel?
Context
40na-asị Erọn, ‘Meere anyị chi, ndị nke ga-edu anyị, nʼihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosis, onye sitere nʼala Ijipt dupụta anyị.’* 41Ha kpụụrụ onwe ha arụsị nke oyiyi nwa ehi, ha butere ihe ịchụ aja nye ya. Ha ṅụrịrị ọṅụ nʼọrụ nke aka ha. 42Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe.* Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma,
“ ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja* unu chụụrụ m
iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara? 43Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk
na kpakpando nke chi unu bụ Refan,
bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha.
Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’* 44“Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.