Native Bible

Acts 5:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama.”

Acts 5:32 in English

Acts 5:32 · Berean Standard Bible

We are witnesses of these things, and so is the Holy Spirit, whom God has given to those who obey Him.”

Context

30Chineke nna nna anyị a kpọlitela Jisọs site nʼọnwụ bụ onye ahụ unu gburu site nʼịkpọgide ya nʼelu osisi. 31Chineke ebuliela ya elu nʼaka nri nke ya onwe ya dị ka Ọkpara eze na Onye nzọpụta, ka o nwee ike inye ndị Izrel niile nchegharị na mgbaghara mmehie. 32Anyị bụ ndị ama nke ihe ndị a, Mmụọ Nsọ onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi bụkwa onyeama.” 33Mgbe ha nụrụ nke a, ọ gbawara ha obi, ha chọọ igbu ha. 34Ma otu onye nʼime ha bụ onye Farisii, bụrụkwa onye ozizi iwu a na-asọpụrụ, aha ya bụ Gamaliel, biliri ọtọ nʼetiti ọgbakọ ahụ, nye iwu ka a kpọpụ ndị ozi ahụ nʼezi nwa oge nta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.