Ọrụ Ndị Ozi 3:5
Acts 3:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye.
Acts 3:5 in English
Acts 3:5 · Berean Standard Bible
So the man gave them his attention, expecting to receive something from them.
Context
3Mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn ka ha na-achọ ịba nʼụlọnsọ ukwu ahụ, o bidoro ịrịọ ha arịrịọ. 4Ma Pita na Jọn legidere ya anya, Pita sịrị, “Lee anyị anya.” 5O legidere ha anya chee na ha ga-enye ya onyinye. 6Ma Pita sịrị, “Enweghị m ọlaọcha maọbụ ọlaedo ma ihe m nwere ka m na-enye gị. Nʼaha Jisọs Kraịst onye Nazaret bilie ọtọ gawa ije.” 7O jidere ya aka nʼaka nri ya, nyere ya aka selite ya elu, ngwangwa, ụkwụ ya na nkwonkwo nke akwara ụkwụ ya nwetara ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.