Native Bible

Acts 3:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’*

Acts 3:23 in English

Acts 3:23 · Berean Standard Bible

Everyone who does not listen to Him will be completely cut off from among his people.*’

Context

21Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ. 22Mosis sịrị, ‘Onyenwe anyị bụ Chineke ga-eme ka onye amụma ga-adị ka m biliere unu site nʼetiti ụmụ nne unu, unu aghaghị ige ntị nʼihe niile ọ ga-agwa unu. 23Onye ọbụla jụrụ ige onye amụma ahụ ntị, ka a ga-ekewapụ kpamkpam site nʼetiti ndị ya ma bibiekwa ya.’* 24“Nʼezie ndị amụma niile site na Samuel na ndị ọzọ so ya nʼazụ, bukwara amụma banyere ụbọchị ndị a. 25Ma unu bụ ndị nketa nke ndị amụma, nakwa nke ọgbụgba ndụ ahụ Chineke na nna nna unu gbara, mgbe ọ gwara Ebraham, ‘Site na mkpụrụ gị ka a ga-agọzi mba niile nke ụwa.’*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.