Ọrụ Ndị Ozi 28:22
Acts 28:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu ọ dị, anyị ga-achọ ịnụta ihe i chere, nʼihi na anyị maara na a na-ekwujọ otu a nʼebe niile.”
Acts 28:22 in English
Acts 28:22 · Berean Standard Bible
But we consider your views worth hearing, because we know that people everywhere are speaking against this sect.”
Context
20Nʼihi nke a, ka m jiri rịọọ ka mụ na unu hụ ma kwurịtakwa okwu. Ọ bụ nʼihi olileanya nke Izrel ka e ji kee m nʼagbụ igwe a.” 21Ha sịrị, “Anyị anataghị akwụkwọ ozi ọbụla site na Judịa banyere gị. Ọ dịghịkwa ụmụnna anyị ọbụla nke si ebe ahụ bịa nke kọrọ maọbụ kwuo okwu ọjọọ ọbụla banyere gị. 22Otu ọ dị, anyị ga-achọ ịnụta ihe i chere, nʼihi na anyị maara na a na-ekwujọ otu a nʼebe niile.” 23Ha yiri agba mgbe ha na ya ga-ezukọta nʼụbọchị ọzọ. Ọtụtụ mmadụ karịrị bịara nʼụlọ ebe ọ na-anọ. Ọ gbara ama banyere alaeze Chineke site nʼakwụkwọ iwu Mosis na nke ndị amụma, ọ gbalịrị ime ka ha kwenye nʼihe banyere Jisọs. O bidoro izi ha ihe site nʼụtụtụ ruo anyasị. 24Ụfọdụ ka e mere ka ha kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.