Ọrụ Ndị Ozi 28:18
Acts 28:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nʼikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa nʼihi na ha achọtaghị ihe kwesiri ịma m ikpe ọnwụ dịka ndị anyị chọrọ.
Acts 28:18 in English
Acts 28:18 · Berean Standard Bible
They examined me and wanted to release me, because there was no basis for a death sentence against me.
Context
16Mgbe anyị bịaruru Rom, e nyere Pọl ohere ibiri onwe ya dịka o si chọọ nʼebe masịrị ya. Ma otu onye agha na-eche ya nche. 17Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ kpọrọ ndịisi ndị Juu. Mgbe ha zukọrọ, ọ gwara ha, “Ụmụnna m, ọ dịghị ihe ọjọọ ọbụla m mere megide ndị nke anyị, maọbụ megide omenaala nna nna anyị ha, ha jidere m na Jerusalem were m nyefee m nʼaka ndị Rom. 18Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nʼikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa nʼihi na ha achọtaghị ihe kwesiri ịma m ikpe ọnwụ dịka ndị anyị chọrọ. 19Ma mgbe ndị Juu jụrụ, ahụrụ m na ọ dị mkpa ibutere Siza ikpe m. Ma o nweghị ihe ọjọọ m bu nʼuche megide ndị obodo m. 20Nʼihi nke a, ka m jiri rịọọ ka mụ na unu hụ ma kwurịtakwa okwu. Ọ bụ nʼihi olileanya nke Izrel ka e ji kee m nʼagbụ igwe a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.