Ọrụ Ndị Ozi 27:30
Acts 27:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha wedatara ụgbọ epeepe e dobere maka ihe mberede, mee dịka ha na-aga itinye arịlịka nʼọnụ ụgbọ mmiri ahụ.
Acts 27:30 in English
Acts 27:30 · Berean Standard Bible
Meanwhile, the sailors attempted to escape from the ship. Pretending to lower anchors from the bow, they let the lifeboat down into the sea.
Context
28Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nʼọnụ ya nʼime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nʼebe ahụ ha nọ. Ha gakwara nʼihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ itoolu. 29Ma egwu juru ha obi nʼihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nʼakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara arịlịka anọ e ji ejide ụgbọ site nʼazụ ụgbọ ahụ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ. 30Mgbe ndị na-eso ụgbọ ahụ kpebiri ịhapụ ya. Ha wedatara ụgbọ epeepe e dobere maka ihe mberede, mee dịka ha na-aga itinye arịlịka nʼọnụ ụgbọ mmiri ahụ. 31Ma Pọl gwara ndị agha na ọchịagha ha okwu, “Ọ bụrụ na ndị a anọgideghị nʼime ụgbọ a, agaghị azọpụta unu.” 32Nʼihi nke a, ndị agha ahụ gbubiri ụdọ e jiri kee ụgbọ epeepe ahụ hapụ ụgbọ epeepe ahụ ka ọ daba nʼime osimiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.