Ọrụ Ndị Ozi 27:26
Acts 27:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.”
Acts 27:26 in English
Acts 27:26 · Berean Standard Bible
However, we must run aground on some island.”
Context
24ọ sịrị, ‘Atụla egwu Pọl, nʼihi na ị ghaghị iguzo nʼihu Siza. Nke ọzọkwa, Chineke emeela amara nye gị ndụ ndị a niile gị na ha so nʼụgbọ eme njem.’ 25Ya mere, ndị ikom nweenụ obi ike! Nʼihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme dị ka o siri gwa m. 26Ma otu ọ dị, a ga-eburu ụgbọ mmiri anyị buba ya nʼotu agwa etiti.” 27Ihe dịka nʼetiti abalị nʼụbọchị nke iri na anọ ebili mmiri a, mgbe anyị na-erugharị nʼosimiri a na-akpọ Adratik, ndị na-anya ụgbọ chere na ala dị nso. 28Ha tụnyere ụdọ e kenyere igwe nʼọnụ ya nʼime osimiri chọpụta na omimi osimiri ahụ dị narị nzọ ụkwụ na iri abụọ nʼebe ahụ ha nọ. Ha gakwara nʼihu tụọkwa ụdọ ahụ ọzọ chọpụta na omimi osimiri ahụ dị iri nzọ ụkwụ itoolu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.