Ọrụ Ndị Ozi 27:19
Acts 27:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị nke atọ ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọbụla nke aka ha ghọtara nʼime osimiri.
Acts 27:19 in English
Acts 27:19 · Berean Standard Bible
On the third day, they threw the ship’s tackle overboard with their own hands.
Context
17Emesịa, anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nʼọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị na Satis. Ha wedatara akwa e kobere nʼelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga. 18Mgbe chi bọrọ, dịka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụbasị ngwongwo ndị dị nʼụgbọ ahụ nʼime osimiri. 19Nʼụbọchị nke atọ ha tụbakwara ngwongwo e ji edozi ụgbọ mmiri na ọtụtụ ihe ọbụla nke aka ha ghọtara nʼime osimiri. 20Mgbe ọtụtụ ụbọchị gara ma ọ dịghị anyanwụ maọbụ kpakpando wapụtaranụ, ma oke ifufe ọjọọ ahụ gara nʼihu na-amagharị, nʼikpeazụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị gwụsịrị. 21Nʼoge a niile, o nweghị onye ọbụla nri ọbụla bara ọnụ. Ma nʼikpeazụ. Pọl kwụụrụ ọtọ nʼetiti ha sị, “Ndị ikom ibe m, ọ bụrụ na unu gere ntị nʼokwu m na mbụ, anyị agaraghị ahapụ Kriit. Anyị gara agbanarị mbibi na ịla nʼiyi nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.