Native Bible

Acts 27:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nʼazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klọda. Nʼebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nʼazụ nʼelu ụgbọ mmiri ahụ.

Acts 27:16 in English

Acts 27:16 · Berean Standard Bible

Passing to the lee of a small island called Cauda,* we barely managed to secure the lifeboat.

Context

14Ma mgbe na-adịghị anya, oke ifufe dị egwu nke si nʼagbata ugwu na ọwụwa anyanwụ kuru site nʼagwa etiti ahụ rịdata. 15Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nʼọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Anyị hapụrụ ya ka o soro ikuku. 16Nʼikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nʼazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klọda. Nʼebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nʼazụ nʼelu ụgbọ mmiri ahụ. 17Emesịa, anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nʼọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị na Satis. Ha wedatara akwa e kobere nʼelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga. 18Mgbe chi bọrọ, dịka osimiri ahụ na-etonye etonye, ndị na-eso ụgbọ bidoro ịtụbasị ngwongwo ndị dị nʼụgbọ ahụ nʼime osimiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.