Native Bible

Acts 27:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe na-adịghị anya, oke ifufe dị egwu nke si nʼagbata ugwu na ọwụwa anyanwụ kuru site nʼagwa etiti ahụ rịdata.

Acts 27:14 in English

Acts 27:14 · Berean Standard Bible

But it was not long before a cyclone called the Northeaster swept down across the island.

Context

12Ma ebe ọnụ mmiri a abụghị ebe dị mma ịnọ nʼoge oyi, ndị ka nʼọnụọgụgụ họọrọ ka ụgbọ ahụ gaa nʼihu, nʼolileanya na a ga-eru Fonikisi ebe ha ga-anọdụ nʼoge oyi. Nke a bụ ọnụ mmiri dị na Kriit, nke chere ihu nʼọwụwa anyanwụ nʼakụkụ ugwu na akụkụ ndịda. 13Mgbe ikuku dị nwayọọ bidoro ifegharị site na ndịda, ha chere na nke a bụ ohere dịrị ha. Nʼihi ya, ha kwọpụrụ ụgbọ nyara ya na-aga nso nso ọnụ mmiri Kriit. 14Ma mgbe na-adịghị anya, oke ifufe dị egwu nke si nʼagbata ugwu na ọwụwa anyanwụ kuru site nʼagwa etiti ahụ rịdata. 15Ndị na-anya ụgbọ ahụ gbalịsịrị ike na mbụ ichigharị ihu ụgbọ ahụ ka ọ gaa nʼọnụ mmiri, ma ọ pụghị ime. Anyị hapụrụ ya ka o soro ikuku. 16Nʼikpeazụ, anyị kwọọrọ ụgbọ anyị gaa nʼazụ agwa etiti nta a na-akpọ Klọda. Nʼebe ahụ anyị jisiri ike kekwasị ụgbọ nta nke ụgbọ mmiri anyị na-adọkpụ nʼazụ nʼelu ụgbọ mmiri ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.