Ọrụ Ndị Ozi 21:14
Acts 21:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ọ na-ekweghị ege anyị ntị, anyị kwụsịrị ma sị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.”
Acts 21:14 in English
Acts 21:14 · Berean Standard Bible
When he would not be dissuaded, we fell silent and said, “The Lord’s will be done.”
Context
12Mgbe anyị nụrụ nke a, anyị na ndị niile nọ nʼebe ahụ rịọrọ Pọl ka ọ ghara ịga Jerusalem. 13Ma Pọl zaghachiri, “Gịnị ka unu na-eme, ọ bụ akwa ka unu na-ebe, na-eme ka obi gbawaa m? Nʼihi na ọ bụghị naanị na m dị njikere ka e kee m agbụ, kama ejikekwara m iwere ndụ m nye na Jerusalem nʼihi aha Onyenwe anyị Jisọs.” 14Ebe ọ na-ekweghị ege anyị ntị, anyị kwụsịrị ma sị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.” 15Mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, anyị jikere bilie ịga Jerusalem. 16Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ahụ ndị nọ na Sizaria, duuru anyị gaa, ha kpọruru anyị nʼụlọ Mnasin, onye Saiprọs ebe anyị ga-anọ dịka ọbịa, onye sitere na mbụ bụrụ onye na-eso ụzọ ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.