Native Bible

Acts 20:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ.

Acts 20:13 in English

Acts 20:13 · Berean Standard Bible

We went on ahead to the ship and sailed to Assos, where we were to take Paul aboard. He had arranged this because he was going there on foot.

Context

11Ọ laghachikwara nʼụlọ elu ahụ, mgbe ọ nyawachara achịcha ma riekwa, o kwugidere okwu tutu chi abọọ, ọ hapụrụ ha bilie ije ya. 12Ha kulitere nwokorobịa ahụ na ndụ nke mere ka ọṅụ jupụta ha nʼobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu. 13Anyị onwe anyị gara nʼihu banye nʼụgbọ mmiri chee ihu ịga Asọs. Ebe anyị zubere iburu Pọl nʼụgbọ anyị. O soghị anyị nʼihi na o zubere iji ụkwụ ruo ebe ahụ. 14Mgbe o zutere anyị nʼAsọs, anyị buru ya nʼụgbọ gaa Mitilen. 15Nʼụbọchị nke ọzọ ya, anyị rutere Kiọs, nʼụbọchị nke so ya, anyị gafere rute Samọs. Ma mgbe otu ụbọchị ọzọ gasịrị, anyị rutere Melitọs.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.