Ọrụ Ndị Ozi 19:40
Acts 19:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na egwu dị, na-eleghị anya a ga-eji ihe nke mere taa boo anyị ebubo na anyị na-ebute ọgbaaghara. Anyị enweghị ọsịsa ziri ezi banyere ọgbaaghara nke a.”
Acts 19:40 in English
Acts 19:40 · Berean Standard Bible
For we are in jeopardy of being charged with rioting for today’s events, and we have no justification to account for this commotion.”
Context
38Ọ bụrụ na Dimitriọs na ndị ọkpụ ụzụ ibe ya nwere ihe ọbụla megide ha, ha gaa nʼụlọikpe. Ndị na-ekpe ikpe ga-eleba okwu ha anya. Kama ha mee ya nʼusoro iwu kwadoro. 39Ma ọ bụrụ na o nwere ihe ọzọ dị iche unu chọrọ ka e mee, a ga-edozi ya na nzukọ nke ndị obodo na-eme nʼụzọ ziri ezi. 40Nʼihi na egwu dị, na-eleghị anya a ga-eji ihe nke mere taa boo anyị ebubo na anyị na-ebute ọgbaaghara. Anyị enweghị ọsịsa ziri ezi banyere ọgbaaghara nke a.” 41Mgbe o kwuchara nke a, ọ gbasara ha.
19:9 Nke a bụ ebe a na-anọ na-akụziri ọha mmadụ ihe.
19:26 Ya bụ, chi nke mmadụ hiwere
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.