Ọrụ Ndị Ozi 18:1
Acts 18:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka nke a mechara, Pọl hapụrụ Atens gaa Kọrint.
Acts 18:1 in English
Acts 18:1 · Berean Standard Bible
After this, Paul left Athens and went to Corinth.
Context
1Ka nke a mechara, Pọl hapụrụ Atens gaa Kọrint. 2Nʼebe ahụ o zutere otu onye Juu a mụrụ nʼobodo Pọntọs, onye a na-akpọ Akwila. Ya na nwunye ya Prisila sitere Itali Klọdiọs nyere iwu ka a chụpụ ndị Juu site nʼobodo Rom. Pọl gara hụ ha, 3nʼihi na ha na-arụ otu ọrụ, o binyere ha, sokwara ha rụkọọ ọrụ nʼihi na ha bụ ndị na-akpa akwa e ji ama ụlọ ikwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.