Ọrụ Ndị Ozi 17:15
Acts 17:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ndị dupuru Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Ha lawara, hapụrụ Saịlas na Timoti ozi ka ha bịakwute ya na-atụfughị oge.
Acts 17:15 in English
Acts 17:15 · Berean Standard Bible
Those who escorted Paul brought him to Athens and then returned with instructions for Silas and Timothy to join him as soon as possible.
Context
13Ma mgbe ndị Juu bi na Tesalonaịka nụrụ na Pọl na-ekwusa oziọma Chineke na obodo Beria, ụfọdụ ha gara nʼebe ahụ na-akpali igwe ndị mmadụ nʼihi iwebata ọgbaaghara. 14Ndị kwere ekwe mere ngwangwa zipụ Pọl ka ọ gaa nʼakụkụ oke osimiri dị nʼebe ahụ. Ma ha hapụrụ Saịlas na Timoti ka ha na ha nọdụ. 15Ma ndị dupuru Pọl sooro ya ruo obodo Atens. Ha lawara, hapụrụ Saịlas na Timoti ozi ka ha bịakwute ya na-atụfughị oge. 16Mgbe Pọl nọ na-echere ha nʼAtens, o wutere mmụọ ya nke ukwuu nʼihi arụsị niile ọ hụrụ, nke jupụtara nʼobodo ahụ. 17Nʼihi nke a, ya na ndị Juu na ndị na-atụ egwu Chineke, na-anọgide nʼụlọ nzukọ na-arụrịta ụka. Kwa ụbọchị, ọ na-apụkwa nʼọma ahịa na-agwa ndị niile o zutere okwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.