Native Bible

Acts 15:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.”

Acts 15:11 in English

Acts 15:11 · Berean Standard Bible

On the contrary, we believe it is through the grace of the Lord Jesus that we are saved, just as they are.”

Context

9O gosighị na o nwere ihe dị iche nʼetiti anyị na ha. Nʼihi na o mere ka obi ha dị ọcha site nʼokwukwe. 10Ugbu a, gịnị mere unu ji anwa Chineke ọnwụnwa site na-itinye nʼolu ndị na-eso ụzọ ya ibu arọ nke anyị maọbụ nna nna anyị ha na-enweghị ike ịdọkpụ? 11Mba, anyị kwenyere na ọ bụ site nʼamara nke Onyenwe anyị Jisọs ka a ga-eji zọpụta anyị, dịka a ga-esi zọpụtakwa ha.” 12Mmadụ niile nọdụrụ nwayọọ, ha bidoro ige ntị nʼakụkọ Banabas na Pọl na-akọrọ ha banyere ihe ịrịbama niile na ọrụ ebube niile Chineke jiri ha rụọ nʼetiti ndị mba ọzọ. 13Mgbe ha kwusiri okwu ndị a, Jemis sịrị, “Ụmụnna m geenụ ntị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.