Native Bible

Acts 14:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia.

Acts 14:24 in English

Acts 14:24 · Berean Standard Bible

After passing through Pisidia, they came to Pamphylia.

Context

22Nʼebe ahụ ha gbara ndị na-eso ụzọ ume kasịekwa ha obi sị ha jidesie okwukwe ahụ ike. Ha sịrị, “Anyị ga-agabiga ọtụtụ mkpagbu dị iche iche tupu anyị abaa nʼalaeze Chineke.” 23Mgbe ha họpụtachara ndị okenye nʼime nzukọ niile. Ha sitere nʼobubu ọnụ na ekpere tinye ha nʼaka Onyenwe anyị, bụ onye ha kwenyere na ya. 24Ha sitere nʼakụkụ Pisidia garuo Pamfilia. 25Mgbe ha zisachara oziọma nʼobodo Pega, ha gbadara gaa Atalia. 26Site nʼebe ahụ, ha sooro ụgbọ mmiri jeruo Antiọk bụ ebe a nọ nyefee ha nʼamara Chineke nʼihi ọrụ ndị a ha rụzuru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.