Native Bible

Acts 14:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Juu, ndị na-anabataghị okwu ahụ, kpaliri ndị mba ọzọ mee ka mkpụrụobi ha jọọ njọ megide ụmụnna.

Acts 14:2 in English

Acts 14:2 · Berean Standard Bible

But the unbelieving Jews stirred up the Gentiles and poisoned their minds against the brothers.

Context

1Nʼobodo Aikoniọm, Pọl na Banabas banyekwara nʼụlọ nzukọ ndị Juu, kwuo okwu nʼụzọ pụrụ iche nke mere nʼọtụtụ mmadụ, ndị Juu na ndị mba ọzọ kwenyekwara. 2Ndị Juu, ndị na-anabataghị okwu ahụ, kpaliri ndị mba ọzọ mee ka mkpụrụobi ha jọọ njọ megide ụmụnna. 3Otu ọ dị, ha nọgidere nʼebe ahụ ogologo oge, na-ekwusakwa okwu nke Onyenwe anyị na-atụghị egwu ọbụla. Onye nke gosikwara na ọ bụ okwu amara ya ka ha na-ekwu site nʼinye ha ike ịrụ ọrụ ịrịbama na ọrụ ebube dị iche iche. 4Ma ndị obodo ahụ kewara abụọ, ụfọdụ nʼime ha dịnyere ndị Juu. Ụfọdụ dịnyekwara ndị ozi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.