Ọrụ Ndị Ozi 10:8
Acts 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ kọchara ha ihe niile, o zigara ha Jopa.
Acts 10:8 in English
Acts 10:8 · Berean Standard Bible
He explained what had happened and sent them to Joppa.
Context
6Ọ bụ ọbịa nʼụlọ otu nwoke a na-akpọ Saimọn, onye na-edozi akpụkpọ anụ. Onye ụlọ ya dị nʼakụkụ osimiri.” 7Mgbe mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu pụrụ, ọ kpọrọ ndị ohu ya abụọ na otu nʼime ndị agha na-eche ya nche nke na-atụkwa egwu Chineke. 8Mgbe ọ kọchara ha ihe niile, o zigara ha Jopa. 9Nʼechi ya, mgbe ha nọ nso nʼebe ahụ, nʼihe dịka elekere iri na abụọ nke ehihie, Pita rigooro nʼelu ụlọ ahụ ikpe ekpere. 10Agụụ bidoro ịgụ ya, ọ chọọ ihe ọ ga-eri. Ma mgbe a na-akwado nri, ọ hụrụ ọhụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.