2 Timoti 4:17
2 Timothy 4:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm.
2 Timothy 4:17 in English
2 Timothy 4:17 · Berean Standard Bible
But the Lord stood by me and strengthened me, so that through me the message would be fully proclaimed, and all the Gentiles would hear it. So I was delivered from the mouth of the lion.
Context
15Kpachara anya nʼebe ọ nọ, nʼihi na o guzosiri ike megide ihe niile anyị kwuru. 16Na mbụ, mgbe m pụtara ikpere ọnụ m, ọ dịghị onye kwụnyeere m. Ha niile gbahapụrụ m. Ka a hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie. 17Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ike ikwusa oziọma ka ndị mba ọzọ niile nụrụ ya. Ọ zọpụtara m, site nʼọnụ ọdụm. 18Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 19Keleere m Prisila na Akwila na ndị niile bi nʼụlọ Onisiferọs.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.