2 Timoti 4:11
2 Timothy 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ naanị Luk nọnyere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nʼihi na ọ ga-enyere m aka nʼije ozi m.
2 Timothy 4:11 in English
2 Timothy 4:11 · Berean Standard Bible
Only Luke is with me. Get Mark and bring him with you, because he is useful to me in the ministry.
Context
9Gbalịsie ike ịbịakwute m ọsịịsọ, 10nʼihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nʼanya ahapụla m gaa Tesalonaịka. Kresens agaala Galeshịa, Taịtọs agakwaala Dalmetia. 11Ọ bụ naanị Luk nọnyere m. Mgbe ị na-abịa, kpọta Mak nʼihi na ọ ga-enyere m aka nʼije ozi m. 12Ezipụla m Taịkikọs ka ọ gaa Efesọs. 13Mgbe ị na-abịa, wetara m uwe m ji achụ oyi, bụ nke m hapụrụ nʼaka Kapọs na Troas, wetakwara m akwụkwọ m niile ahụ dị nʼebe ahụ, ọkachasị akwụkwọ akpụkpọ anụ niile ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.