Native Bible

2 Timothy 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke.

2 Timothy 1:7 in English

2 Timothy 1:7 · Berean Standard Bible

For God has not given us a spirit of fear,* but of power, love, and self-control.

Context

5Emere m ka m cheta okwukwe ihu abụọ nʼadịghị nke i nwere, bụ okwukwe nke burii ụzọ dịrị nʼime nne nne gị Lọịsi, bịa dịkwa nʼime nne gị Yunaịsi. Emere ka m kwenye na otu okwukwe ahụ dịkwa nʼime gị. 6Nʼihi nke a, achọrọ m ichetara gị ka i mee ka onyinye Chineke ahụ i nwere na-enwu dị ka ọkụ, bụ nke i natara mgbe m bikwasịrị gị aka m abụọ nʼisi. 7Nʼihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị mmụọ na-emejupụta anyị nʼike, na ịhụnanya, na uche zuruoke. 8Ihere emela gị ikwupụta ama banyere Onyenwe anyị maọbụ banyere m bụ onye mkpọrọ ya. Kama, site nʼike Chineke, soro m hụọ ahụhụ nʼihi oziọma ahụ. 9Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.