2 Ndị Tesalonaịka 3:9
2 Thessalonians 3:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ịnara unu ihe oriri, kama ọ bụ ka anyị kuziere unu site nʼomume anyị ihe unu ga na-eṅomi.
2 Thessalonians 3:9 in English
2 Thessalonians 3:9 · Berean Standard Bible
Not that we lack this right, but we wanted to offer ourselves as an example for you to imitate.
Context
7Nʼihi na unu maara nke ọma nʼime onwe unu na unu kwesiri ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọbụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesiri ịrụ. 8O nweghị onye ọbụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ya ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị nʼọrụ ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọbụla. 9Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ịnara unu ihe oriri, kama ọ bụ ka anyị kuziere unu site nʼomume anyị ihe unu ga na-eṅomi. 10Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.” 11Ma anyị anụla na ụfọdụ nʼetiti unu na-anọ nkịtị na-arụghị ọrụ ọbụla, kama ndị dị otu a na-agagharị, na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha. Ha anaghị arụ ọrụ ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.