Native Bible

2 Thessalonians 3:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nweghị onye ọbụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ya ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị nʼọrụ ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọbụla.

2 Thessalonians 3:8 in English

2 Thessalonians 3:8 · Berean Standard Bible

nor did we eat anyone’s food without paying for it. Instead, in labor and toil, we worked night and day so that we would not be a burden to any of you.

Context

6Ụmụnna, nke a bụ iwu anyị na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka unu zere onye ọbụla kpọrọ onwe ya onye kwere ekwe nʼime unu na-ebi ndụ umengwụ na onye na-adịghị eso ozizi nke unu natara nʼaka anyị. 7Nʼihi na unu maara nke ọma nʼime onwe unu na unu kwesiri ịgbaso omume anyị. O nweghị mgbe ọbụla unu hụrụ anyị ka anyị na-agagharị hapụ ọrụ anyị kwesiri ịrụ. 8O nweghị onye ọbụla anyị riri nri ya nke anyị na-ebughị ụzọ kwụọ ya ụgwọ. Kama anyị rụsịrị ọrụ ike, dọgbukwaa onwe anyị nʼọrụ ehihie na abalị, ka anyị ghara ịbụ ibu arọ nye onye ọbụla. 9Ọ bụghị na anyị enweghị ikike ịnara unu ihe oriri, kama ọ bụ ka anyị kuziere unu site nʼomume anyị ihe unu ga na-eṅomi. 10Ọ bụladị mgbe anyị na unu nọ, anyị nyere unu iwu a sị, “Onye ọbụla na-agaghị ọrụ ya erila nri.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.