Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel, nʼihi na ị kpugheerela ohu gị ihe a, na-asị, ‘Aga m ewuru gị ụlọ.’ Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere a.

2 Samuel 7:27 in English

2 Samuel 7:27 · Berean Standard Bible

For You, O LORD of Hosts, the God of Israel, have revealed this to Your servant when You said, ‘I will build a house for you.’ Therefore Your servant has found the courage to offer this prayer to You.

Context

25“Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, debe nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị 26Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke na-achị Izrel’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị bụ Devid guzosie ike nʼanya gị. 27“O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel, nʼihi na ị kpugheerela ohu gị ihe a, na-asị, ‘Aga m ewuru gị ụlọ.’ Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere a. 28O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, ị bụ Chineke nʼezie. Okwu gị kwesiri ntụkwasị obi.* I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a. 29Ugbu a biko, ka ọ masị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ka ọ dịgide nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi. Nʼihi na gị, o Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ekwuola ya, sitekwa na ngọzị gị, ụlọ ohu gị ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.” 7:13 7:16 7:28 Ọpụ 34:8; Jos 21:45; Jọn 17:17

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.