Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke na-achị Izrel’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị bụ Devid guzosie ike nʼanya gị.

2 Samuel 7:26 in English

2 Samuel 7:26 · Berean Standard Bible

so that Your name will be magnified forever when it is said, ‘The LORD of Hosts is God over Israel.’ And the house of Your servant David will be established before You.

Context

24I meela ka ndị gị Izrel guzosie ike, dịka ndị nke gị ruo mgbe ebighị ebi. Ma gị onwe gị kwa, Onyenwe anyị, abụrụla Chineke ha. 25“Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, debe nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị 26Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke na-achị Izrel’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị bụ Devid guzosie ike nʼanya gị. 27“O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke Izrel, nʼihi na ị kpugheerela ohu gị ihe a, na-asị, ‘Aga m ewuru gị ụlọ.’ Ya mere, ohu gị ji nwee obi ike ikpere gị ekpere a. 28O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, ị bụ Chineke nʼezie. Okwu gị kwesiri ntụkwasị obi.* I kweekwala ohu gị nkwa ihe ọma ndị a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.