2 Samuel 6:21
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu Onyenwe anyị onye họpụtara m karịa nna gị* maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, Onyenwe anyị ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ Onyenwe anyị.
2 Samuel 6:21 in English
2 Samuel 6:21 · Berean Standard Bible
But David said to Michal, “I was dancing before the LORD, who chose me over your father and all his house when He appointed me ruler over the LORD’s people Israel. I will celebrate before the LORD,
Context
19O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya. 20Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.” 21Ma Devid zara Mikal sị ya, “Ọ bụ nʼihu Onyenwe anyị onye họpụtara m karịa nna gị* maọbụ onye ọbụla ọzọ sitere nʼụlọ ya ka m tere egwu. E, Onyenwe anyị ahụ họpụtara m ịbụ onyendu Izrel, ndị nke ya. Nʼezie, aga m aga nʼihu ịkpa agwa dịka onye nzuzu nʼihi ịsọpụrụ Onyenwe anyị. 22E, aga m aga nʼihu ịghọ onye na-enweghị uche, na onye e weturu ala nʼanya onwe m. Ma ụmụ agbọghọ ndị ahụ i kwuru okwu ha, ha ga-asọpụrụ m!” 23Mikal, ada Sọl amụtaghị nwa ọbụla ruo nʼoge ọnwụ ya.
6:2 Ya bụ Kiriat Jearim. 1Ih 13:6
6:8 Perez Ụza pụtara ihe ntiwapụta megide Ụza
6:21 1Sa 13:14; 15:28
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.