Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ndị Filistia bịara, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim niile.

2 Samuel 5:18 in English

2 Samuel 5:18 · Berean Standard Bible

Now the Philistines had come and spread out in the Valley of Rephaim.

Context

16Elishama, Eliada na Elifelet. 17Mgbe ndị Filistia nụrụ na eteela Devid mmanụ ị bụ eze ndị Izrel, ha pụrụ ka igwe ha niile ha ịchọ ya. Ma Devid nụrụ maka ya, gbadaa nʼime ebe ahụ e wusiri ike. 18Ma ndị Filistia bịara, gbasaa onwe ha na Ndagwurugwu Refaim niile. 19Mgbe ahụ, Devid jụrụ* Onyenwe anyị ase sị, “Ọ bụ m gaa buso ndị Filistia agha? Ị ga-enyefe ha nʼaka m?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Gaa, nʼihi na aghaghị m inyefe ndị Filistia nʼaka gị.” 20Ya mere, Devid gara Baal-Perazim, meriekwa ha nʼebe ahụ. O kwuru sị, “Onyenwe anyị enupula megide ndị iro m nʼihu m, dịka idee mmiri si enupu.” Nʼihi ya, a kpọrọ ebe ahụ Baal-Perazim.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.