2 Samuel 3:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O ruo, mgbe agha na-aga nʼihu nʼetiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid, na Abna nọ na-eme ka ọnọdụ ya sie ike nʼụlọ Sọl.
2 Samuel 3:6 in English
2 Samuel 3:6 · Berean Standard Bible
During the war between the house of Saul and the house of David, Abner had continued to strengthen his position in the house of Saul.
Context
4Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit.
Nke ise bụ Shefataya nwa Abital; 5nke isii bụ Itream, nwa nwoke Egla nwunye Devid.
Ndị a ka a mụtaara Devid na Hebrọn. 6O ruo, mgbe agha na-aga nʼihu nʼetiti ụlọ Sọl na ụlọ Devid, na Abna nọ na-eme ka ọnọdụ ya sie ike nʼụlọ Sọl. 7Ma Sọl nwererịị otu iko nwanyị aha ya bụ Rizpa, nwa Aịa. Ishboshet jụrụ Abna ajụjụ sị, “Gịnị mere gị na iko nwanyị nna m ji dinaa?” 8Iwe were Abna nke ukwuu nʼihi ihe Ishboshet kwuru. Ya mere, ọ zara, “Ọ bụ isi nkịta nke ụlọ Juda ka m bụ? Taa ka m ji obi m niile na-ejere ụlọ nna gị, bụ Sọl, na ezinaụlọ ya, na ndị enyi ya ozi. Ewerebeghị m gị nyefee nʼaka Devid. Ma lee, ugbu a i na-ebo m ebubo ajọ omume nʼihe metụtara nwanyị a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.