2 Samuel 3:11
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ishboshet ekwughị ihe ọbụla nʼihi na ọ na-atụ Abna egwu.
2 Samuel 3:11 in English
2 Samuel 3:11 · Berean Standard Bible
And for fear of Abner, Ish-bosheth did not dare to say another word to him.
Context
9Ka Chineke mesoo Abna mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m emereghị Devid ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye ya. 10Ịnapụ ụlọ Sọl alaeze ahụ, na ime ka ocheeze Devid guzosie ike nʼebe Izrel niile na Juda niile nọ, site na Dan ruo Bịasheba.”* 11Ishboshet ekwughị ihe ọbụla nʼihi na ọ na-atụ Abna egwu. 12Ngwangwa, Abna zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Devid sị ya, “Onye nwee ala a? Ka mụ na gị gbaa ndụ. Aga m enyere gị aka kpọghachite ndị Izrel ka ha dịnyeere gị.” 13Devid sịrị, “Ọ dị mma. Mụ na unu ga-agba ndụ. Ma ọ dị otu ihe m chọrọ nʼaka unu. Unu agaghị ahụ ihu m anya ma ọ bụrụ na unu eduteghị Mikal, nwa Sọl, mgbe unu ga-abịa ịhụ m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.