2 Samuel 22:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ. Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda.
2 Samuel 22:14 in English
2 Samuel 22:14 · Berean Standard Bible
The LORD thundered from heaven; the voice of the Most High resounded.
Context
12O mere ọchịchịrị ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu,
bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. 13Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya,
amụma egbe eluigwe nwupụtara ire ọkụ. 14Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe bigbọọ.
Olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda. 15Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa.
O jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha. 16E kpughere ala ala nke oke osimiri.
Gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ,
site nʼịba mba nke Onyenwe anyị,
na nkuume si nʼimi ya pụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.