2 Samuel 20:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwanyị ahụ ji ndụmọdụ nke amamihe ya gakwuru ndị obodo. Ha bipụrụ Sheba nwa Bikri isi, tụpụtara ya Joab. Ya mere na ọ fụrụ opi ike ya, ndị ikom ya sitere nʼobodo ahụ lasaa, onye ọbụla lara nʼụlọ nke ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem.
2 Samuel 20:22 in English
2 Samuel 20:22 · Berean Standard Bible
Then the woman went to all the people with her wise counsel, and they cut off the head of Sheba son of Bichri and threw it to Joab. So he blew the ram’s horn and his men dispersed from the city, each to his own home. And Joab returned to the king in Jerusalem.
Context
20Joab zara sị, “Mba! Ọ bụghị uche m ịla obodo a nʼiyi. 21Ọ bụghị otu a ka okwu ahụ dị. Otu nwoke a na-akpọ Sheba nwa Bikri, nke si nʼobodo ugwu Ifrem e weliela aka ya imegide eze, bụ Devid. Nyefee nwoke a ọsịịsọ nʼaka m, aga m esi nʼobodo a pụọ.”
Nwanyị ahụ sịrị Joab, “A ga-atụpụtara gị isi ya site na mgbidi.” 22Nwanyị ahụ ji ndụmọdụ nke amamihe ya gakwuru ndị obodo. Ha bipụrụ Sheba nwa Bikri isi, tụpụtara ya Joab. Ya mere na ọ fụrụ opi ike ya, ndị ikom ya sitere nʼobodo ahụ lasaa, onye ọbụla lara nʼụlọ nke ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem. 23Ọ bụ Joab ka e mere onyeisi agha na-achị ndị agha niile nke Izrel.
Benaya nwa Jehoiada bụ onye na-achịkọta ndị Keret na ndị Pelet na-eche eze nche. 24Adoniram* na-ahụ maka ihe banyere ndị ọrụ mmanye.
Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta ihe niile na-eme nʼobodo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.