Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ndị ikom Devid gburu narị ndị agha Benjamin atọ na iri isii, bụ ndị so Abna.

2 Samuel 2:31 in English

2 Samuel 2:31 · Berean Standard Bible

but they had struck down 360 Benjamites who were with Abner.

Context

29Nʼabalị ahụ, Abna na ndị ikom ya jere ije gafee ndagwurugwu Jọdan, gabigakwa osimiri Jọdan, jee ije nʼụtụtụ echi ya tutu ha eruo Mahanaim. 30Joab kwụsịrị ịchụ Abna ọsọ, ọ chịkọtara ndị agha niile. Mgbe ọ gụrụ ha ọnụ, ọ chọpụtara na mmadụ iri na itoolu nʼime ndị ikom Devid, tinyere Asahel nwanne ya, bụ ndị na-alọtaghị agha. 31Ma ndị ikom Devid gburu narị ndị agha Benjamin atọ na iri isii, bụ ndị so Abna. 32Emesịa, Joab na ndị agha ya buuru ozu Asahel gaa lie ya na Betlehem, nʼili nna ya. Ha jere ije abalị ahụ niile tutu ha erute Hebrọn mgbe chi bidoro ịbọ. 2:8 Abna, bụ nwa nwanne nna Sọl. Ọ bụ ọchịagha Sọl, onye gbalịsịrị ike ihu nʼocheeze Sọl dịgidere na-aga nʼihu. 1Sa 14:50; 2Sa 3:6 2:9 Ndị Ashuri bụ ndị ezinaụlọ si nʼebo Asha Nkp 1:31-32; Jos 19:24-31 2:13 Dịka Abna, ọchịagha Sọl, bụ nwa nwanne nna ya 1Sa 2:8 Otu a ka Joab, ọchịagha Devid, Abishai na Asahel dị nye Devid. Ha bụ ụmụ nwanne ya nwanyị. 2:28 Ị fụụ opi ike, nwere ike ị bụ ịkpọsa mbido agha, maọbụ mkpọsa ka a kwụsị agha. Nkp 7:16-20; 2Sa 2:28; 20:22

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.