2 Samuel 19:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Shimei, nwa Gera, onye Benjamin, nwoke ahụ sitere na Bahurim, mere ngwangwa soro ndị ikom Juda pụta izute eze Devid.
2 Samuel 19:16 in English
2 Samuel 19:16 · Berean Standard Bible
Then Shimei son of Gera, a Benjamite from Bahurim, hurried down with the men of Judah to meet King David,
Context
14Amasa mere ka obi ndị okenye Juda rulata, dịka otu mmadụ. Ha zigara eze ozi, sị, “Lọghachikwute anyị, gị na ndị ohu gị niile.” 15Mgbe ahụ, eze lọghachitere na Jọdan.
Ndị ikom Juda bịarutere Gilgal izute eze, na ịkpọfeta ya Jọdan. 16Shimei, nwa Gera, onye Benjamin, nwoke ahụ sitere na Bahurim, mere ngwangwa soro ndị ikom Juda pụta izute eze Devid. 17Ya na puku ndị ikom Benjamin sokwa. Ziba, onyeozi Sọl, na ụmụ ya ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ ndị ozi ya, mekwara ngwangwa ịbịarute Jọdan tupu eze erute nʼebe ahụ. 18Ha gabigara mmiri nʼebe ọ dị nta ịkwọfe ndị ụlọeze nʼụgbọ mmiri, na ime ihe ọbụla dị mma nʼanya ya.
Mgbe Shimei nwa Gera gafere Jọdan, ọ dara nʼala nʼihu eze,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.