Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, eze lọghachitere na Jọdan. Ndị ikom Juda bịarutere Gilgal izute eze, na ịkpọfeta ya Jọdan.

2 Samuel 19:15 in English

2 Samuel 19:15 · Berean Standard Bible

So the king returned, and when he arrived at the Jordan, the men of Judah came to Gilgal to meet him and escort him across the Jordan.

Context

13Gwakwanụ Amasa sị ya, ‘Ọ bụ na ị bụghị ọkpụkpụ m na anụ ahụ m? Ka Chineke mesoo m mmeso otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na ị bụghị ọchịagha m malite taa nʼọnọdụ Joab.’ ” 14Amasa mere ka obi ndị okenye Juda rulata, dịka otu mmadụ. Ha zigara eze ozi, sị, “Lọghachikwute anyị, gị na ndị ohu gị niile.” 15Mgbe ahụ, eze lọghachitere na Jọdan. Ndị ikom Juda bịarutere Gilgal izute eze, na ịkpọfeta ya Jọdan. 16Shimei, nwa Gera, onye Benjamin, nwoke ahụ sitere na Bahurim, mere ngwangwa soro ndị ikom Juda pụta izute eze Devid. 17Ya na puku ndị ikom Benjamin sokwa. Ziba, onyeozi Sọl, na ụmụ ya ndị ikom iri na ise, na iri ndị ozi abụọ ndị ozi ya, mekwara ngwangwa ịbịarute Jọdan tupu eze erute nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.