Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Absalọm zutere ndị agha Devid. Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga.

2 Samuel 18:9 in English

2 Samuel 18:9 · Berean Standard Bible

Now Absalom was riding on his mule when he met the servants of David, and as the mule went under the thick branches of a large oak,* Absalom’s head was caught fast in the tree. The mule under him kept going, so that he was suspended in midair.

Context

7Ndị agha Devid tigbukwara ndị agha Izrel. Ha gburu iri puku ndị agha abụọ nʼụbọchị ahụ. 8Agha ahụ gbasara nʼelu ala ahụ niile. Ndị nwụrụ nʼọhịa nʼetiti ụmụ Izrel karịrị ndị e gburu egbu. 9Absalọm zutere ndị agha Devid. Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga. 10Otu nʼime ndị ikom ahụ hụrụ ya, kọọrọ Joab, “Lee, ahụrụ m Absalọm ebe ọ kwụ nʼelu osisi ook.” 11Joab sịrị nwoke ahụ onye gwara gị, “Gịnị, ị hụrụ ya? Gịnị mere i tigbughị ya ka o ruo nʼala nʼebe ahụ? Mgbe ahụ, agaara m enye gị shekel ọlaọcha iri, na belịt a na-enye onye bụ dike nʼagha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.